Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Unu emeela ihe niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu. Unu egeela ntị nʼolu m, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu.

Joshua 22:2 in English

Joshua 22:2 · Berean Standard Bible

and told them, “You have done all that Moses the servant of the LORD commanded you, and you have obeyed my voice in all that I commanded you.

Context

1Emesịa, Joshua kpọkọtara ndị agha si nʼebo Ruben, na Gad, na ọkara Manase, gwa ha okwu sị: 2“Unu emeela ihe niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu. Unu egeela ntị nʼolu m, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu. 3E, unu arụzuola ọrụ ahụ Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ahapụghị ụmụnna unu nʼọgbọ agha ogologo ụbọchị ndị a niile. 4Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.