Joshua 21:1
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel,
Joshua 21:1 in English
Joshua 21:1 · Berean Standard Bible
Now the family heads of the Levites approached Eleazar the priest, Joshua son of Nun, and the heads of the other tribes of Israel
Context
1Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel, 2na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “Onyenwe anyị nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.” 3Nʼihi nke a, dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.