Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.” 2:1 Jeriko bụ obodo ochie e wuru nke ọma, wusikwaa ike. Obodo e ji mgbidi e wusiri ike gbaa gburugburu, nke ọtụtụ iyi, tinyekwara osimiri gbara gburugburu. Jos 15:1-6 E wuru ya ka o nwee ike ịnagide atụmatụ ọbụla nke ndị iro na-atụ, maka ịba nʼime ya. O ruru ihe dịka kilomita asatọ ma a na-aga nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Jọdan, bụrụkwa ụzọ dị oke mkpa a ga-eji baa nʼala nkwa ahụ. 2:9 Jen 35:5

Joshua 2:24 in English

Joshua 2:24 · Berean Standard Bible

“The LORD has surely delivered the entire land into our hands,” they said to Joshua. “Indeed, all who dwell in the land are melting in fear of us.”

Context

22Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha. 23Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha. 24Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.” 2:1 Jeriko bụ obodo ochie e wuru nke ọma, wusikwaa ike. Obodo e ji mgbidi e wusiri ike gbaa gburugburu, nke ọtụtụ iyi, tinyekwara osimiri gbara gburugburu. Jos 15:1-6 E wuru ya ka o nwee ike ịnagide atụmatụ ọbụla nke ndị iro na-atụ, maka ịba nʼime ya. O ruru ihe dịka kilomita asatọ ma a na-aga nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Jọdan, bụrụkwa ụzọ dị oke mkpa a ga-eji baa nʼala nkwa ahụ. 2:9 Jen 35:5

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.