Joshua 19:25
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Helkat, Hali, Beten, Akshaf,
Joshua 19:25 in English
Joshua 19:25 · Berean Standard Bible
Their territory included Helkath, Hali, Beten, Achshaph,
Context
23Ya mere, obodo ukwu ndị a na obodo nta ha dị nʼala ahụ ebo Isaka nwetara dịka ihe nketa ha, dị ka ikwu ha si dị. 24Ebo nke ise e kenyere ala site nʼife nza bụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị. 25Ala na obodo ha ketara bụ ndị a:
Helkat, Hali, Beten, Akshaf, 26Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat. 27O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.