Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben.

Joshua 18:17 in English

Joshua 18:17 · Berean Standard Bible

From there it curved northward and proceeded to En-shemesh and on to Geliloth facing the Ascent of Adummim, and continued down to the Stone of Bohan son of Reuben.

Context

15Oke ala ha na ndịda sitere na nsọtụ akụkụ Kiriat Jearim rute nʼisi iyi mmiri Neftoa. 16O sitekwara nʼebe ahụ gbada ruo na ndịda ugwu ahụ nke chere ihu na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nʼakụkụ ugwu Ndagwurugwu nke Refaim. O sitekwara nʼebe ahụ gafee ruokwa nʼakụkụ ndịda ugwu obodo ndị Jebus, ruo En-Rogel. 17Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben. 18O sitere nʼebe ahụ gafee nʼakụkụ ugwu Bet-Araba gbadata rute nʼAraba, 19ọ gafere gbatịrị ruo nʼakụkụ Bet-Hogla na mgbago ugwu, pụta nʼakụkụ ugwu nke osimiri Nnu, nke bụ nʼakụkụ ndịda ọnụ mmiri osimiri Jọdan. Nke a bụ oke ala ha nʼakụkụ ndịda.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.