Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Joshua feere ha nza na Shaịlo nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ ka ọ nọ keere ndị Izrel ala ahụ dịka ebo ha si dị.

Joshua 18:10 in English

Joshua 18:10 · Berean Standard Bible

And Joshua cast lots for them in the presence of the LORD at Shiloh, where he distributed the land to the Israelites according to their divisions.

Context

8Ya mere, mgbe ndị ikom nledo ahụ gawara ijegharị nʼala ahụ niile, Joshua gwara ha okwu sị, “Jeenụ jegharịa nʼala ahụ niile. Depụtakwanụ otu unu chere a ga-esi kee ya nʼakwụkwọ. Mgbe unu lọtara aga m anọ nʼebe a bụ Shaịlo jụta Onyenwe anyị ase site nʼife nza, chọpụta ala nke ebo ọbụla ga-eketa.” 9Ndị ikom ahụ gabigara ala ahụ, depụta ya nʼakwụkwọ, nʼobodo nʼobodo dịka o si dị nʼoke asaa. Mgbe ha mesịrị nke a, ha lọghachikwutere Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu nʼime Shaịlo. 10Joshua feere ha nza na Shaịlo nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ ka ọ nọ keere ndị Izrel ala ahụ dịka ebo ha si dị. 11Ndị mbụ e kenyere ala site nʼife nza bụ ebo Benjamin dịka ikwu ha si dị. Ala niile e kenyere ebo Benjamin bụ nke dị nʼetiti ala e nyere ebo Juda na Josef. 12Oke ala ha nʼakụkụ ugwu sitere nʼosimiri Jọdan ruo nʼakụkụ ugwu Jeriko. Nʼọdịda anyanwụ o sitere na Jeriko ruo ala ugwu ugwu ahụ niile, ruokwa nʼọzara Bet-Aven.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.