Joshua 17:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ụmụ Manase enweghị ike ịchụpụ ndị Kenan bi nʼobodo ndị ahụ, nʼihi na ndị Kenan nọgidere bichie obodo ndị a.
Joshua 17:12 in English
Joshua 17:12 · Berean Standard Bible
But the descendants of Manasseh were unable to occupy these cities, because the Canaanites were determined to stay in this land.
Context
10Ala dị na ndịda bụ nke e kenyere Ifrem, ma ala mgbago ugwu bụ nke Manase. Ala ndị Manase gbatịrị ruo nʼosimiri Mediterenịa ma ha na ndị Asha nwekọrọ oke ala nʼakụkụ ugwu, ebe ha na ndị Isaka nwere oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. 11Manase ka e nyere obodo ndị a, nke dị nʼala e nyere Isaka na Asha: obodo Bet-Shan, na Ibleam, na Doa, na Endoa, na Teanak, na Megido, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Obodo nke atọ bụ Nafọt. 12Ma ụmụ Manase enweghị ike ịchụpụ ndị Kenan bi nʼobodo ndị ahụ, nʼihi na ndị Kenan nọgidere bichie obodo ndị a. 13Ma nʼikpeazụ, mgbe ụmụ Izrel ghọrọ ndị dị ike, ha achụpụghị ndị Kenan niile bi nʼobodo ndị a kpamkpam, kama ha mere ka ha bụrụ ndị na-ejere ụmụ Izrel ozi, dịka ndị ohu ha. 14Ma ụmụ ụmụ Josef* sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na Onyenwe anyị gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.