Joshua 15:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O sikwara ebe ahụ ruo ndịda ugwu Ekrọn, tụgharịa ruo Shikerọn, gafee ya, ruo nʼugwu Baala, sitekwa nʼebe ahụ ruo Jabneel, oke ala ahụ kwụsịrị nʼosimiri.
Joshua 15:11 in English
Joshua 15:11 · Berean Standard Bible
Then it went out to the northern slope of Ekron, curved toward Shikkeron, proceeded to Mount Baalah, went on to Jabneel, and ended at the Sea.
Context
9Site nʼelu ugwu ebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị ruo na mmiri ime ala Neftoa, pụta site nʼebe ahụ ruo obodo niile dị nso ugwu Efrọn. Site nʼEfrọn, oke ala ahụ gbadara ruo Baala (nke aha ya ọzọ bụ Kiriat Jearim). 10Oke ala ahụ mere dịka ọ ga-agba Baala gburugburu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site nʼebe ahụ pụta nʼugwu Sia, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼakụkụ ugwu Jearim (ya bụ Kesalon), gbatịa ruo na ndịda Bet-Shemesh, gafee ruo nʼọdịda anyanwụ oke ala Timna. 11O sikwara ebe ahụ ruo ndịda ugwu Ekrọn, tụgharịa ruo Shikerọn, gafee ya, ruo nʼugwu Baala, sitekwa nʼebe ahụ ruo Jabneel, oke ala ahụ kwụsịrị nʼosimiri. 12Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa.
Ndị a bụ oke ala gbara ndị Juda gburugburu dịka ikwu ha niile si dị. 13Dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị, Joshua nyere Kaleb nwa Jefune oke nʼetiti ndị Juda. O kenyere ya Kiriat Aaba, ya bụ, Hebrọn. Aaba bụ nna nna Anak.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.