Joshua 14:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro Onyenwe anyị Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’
Joshua 14:9 in English
Joshua 14:9 · Berean Standard Bible
On that day Moses swore to me, saying, ‘Surely the land on which you have set foot will be an inheritance to you and your children forever, because you have wholly followed the LORD my God.’
Context
7Agbara m iri afọ anọ nʼoge ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ anyị ịga iledo ala ndị Kenan anya. Mgbe anyị lọghachiri, agwara m ya okwu, kọwaara ya ihe m chere nʼobi m bụ eziokwu. 8Ma ụmụnna anyị, ndị anyị na ha so gaa, menyere ụmụ Izrel egwu, mee ka obi ha daa mba ịchọ ịbanye nʼala ahụ e kwere anyị na nkwa. Ma ebe m nọgidere jiri obi m niile soro Onyenwe anyị Chineke m, 9Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro Onyenwe anyị Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’ 10“Ugbu a, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa, o meela ka m dị ndụ. Nke a bụ iri afọ anọ na ise kemgbe Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a, mgbe Izrel na-awagharị nʼọzara. Ma ugbu a, lee, agbaala m iri afọ asatọ na ise taa. 11M dị ike taa dịka m dị nʼụbọchị ahụ Mosis zipụrụ m. Dịka ike m dị mgbe ahụ, adịkwa m ike ugbu a, ịpụ buo agha ma batakwa
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.