Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Izrel keere ala ahụ nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

Joshua 14:5 in English

Joshua 14:5 · Berean Standard Bible

So the Israelites did as the LORD had commanded Moses, and they divided the land.

Context

3Ma Mosis enyelarị ebo abụọ na ọkara ala nke ha nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Ma o kenyeghị ndị Livayị ihe nketa ọbụla nʼetiti ha. 4Nʼihi na ụmụ Josef dị ebo abụọ, ya bụ Manase na Ifrem.* Enyeghị ndị Livayị oke nʼala ahụ, karịa obodo ụfọdụ ebe ha ga-ebi na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. 5Ndị Izrel keere ala ahụ nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị. 6Nʼoge a, ụmụ Juda zipụrụ ndị ozi ndị jekwuuru Joshua na Gilgal. Kaleb, nwa Jefune, onye Keniz so ha nʼije a. Mgbe ha bịarutere, Kaleb gwara Joshua okwu sị ya, “I chetakwara okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis onye nke Chineke banyere gị na banyere mụ onwe m, mgbe anyị nọ na Kadesh Banea? 7Agbara m iri afọ anọ nʼoge ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ anyị ịga iledo ala ndị Kenan anya. Mgbe anyị lọghachiri, agwara m ya okwu, kọwaara ya ihe m chere nʼobi m bụ eziokwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.