Joshua 13:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tinyere ndị ha gburu nʼọgbọ agha, ụmụ Izrel ji mma agha gbuo Belam nwa Beoa, onye na-agba aja.
Joshua 13:22 in English
Joshua 13:22 · Berean Standard Bible
The Israelites also killed the diviner Balaam son of Beor along with the others they put to the sword.
Context
20na Bet-Peoa, na Bet-Jeshimọt, nke dị nʼebe dị na mgbada ugwu Pisga; 21na obodo niile dị nʼala larịị ahụ, na ala Saịhọn niile, onye bụ eze ndị Amọrị nke chịrị na Heshbọn. Mosis lụgburu ya, lụgbukwaa ndịisi Midia bụ Evi, na nke Rekem, na nke Zua, na nke Hua, na nke Reba, ụmụ ndị eze ha na Saịhọn jikọtara aka buo agha. 22Tinyere ndị ha gburu nʼọgbọ agha, ụmụ Izrel ji mma agha gbuo Belam nwa Beoa, onye na-agba aja. 23Ya mere, oke ala ebo Ruben dị nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Obodo ukwu na obodo nta ndị a bụ ihe ha nwetara dịka ihe nketa ha. Ezinaụlọ ọbụla nwetakwara oke nke ha dịka ikwu ha si dị. 24Mosis nyekwara ebo Gad ala nke ha site nʼala ahụ ha lụgburu, dịka ikwu ha si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.