Joshua 13:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nweghị ala o kenyere ebo Livayị. Nʼihi na Onyenwe anyị kwere ha nkwa na ihe nketa ha ga-abụ ihe aja onyinye niile e si nʼọkụ na-ewetara Onyenwe anyị Chineke Izrel.
Joshua 13:14 in English
Joshua 13:14 · Berean Standard Bible
To the tribe of Levi, however, Moses had given no inheritance. The offerings made by fire to the LORD, the God of Israel, are their inheritance, just as He had promised them.
Context
12Ya bụ, obodo niile nke Ọg eze ndị Bashan na-achị, mgbe isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. (Ọ bụ eze ikpeazụ nʼagbụrụ ndị Refaim.) Mosis busoro Saịhọn na Ọg agha, tigbuo ha, napụkwa ha ala ha. 13Ma ndị Izrel achụpụghị ndị Geshua na ndị Maaka, ya mere, ha nọgidere na-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo taa. 14O nweghị ala o kenyere ebo Livayị. Nʼihi na Onyenwe anyị kwere ha nkwa na ihe nketa ha ga-abụ ihe aja onyinye niile e si nʼọkụ na-ewetara Onyenwe anyị Chineke Izrel. 15Nke a bụ ala Mosis nyere ebo Ruben dịka agbụrụ ha si dị, ka ọ bụrụ ihe nketa ha. 16Ala ha gbatịrị site nʼAroea, na ndagwurugwu iyi Anọn, sitekwa nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ na ala dị larịị gabiga gafee Medeba,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.