Joshua 13:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gụnyekwara Gilead, nʼoke ala ndị Geshua, na ndị Maaka, na ugwu Hemon niile, na Bashan niile, ruokwa Saleka.
Joshua 13:11 in English
Joshua 13:11 · Berean Standard Bible
also Gilead and the territory of the Geshurites and Maacathites, all of Mount Hermon, and all Bashan as far as Salecah—
Context
9Ala ha gbatịrị site nʼAroea nke dị na ndagwurugwu Anọn, na site nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ, ruo nʼala dị larịị nke gbatịrị site na Medeba ruo Dibọn. 10Ọ gbatịkwara ruo nʼoke ala ndị Amọn, tinyere obodo niile nke Saịhọn, eze ndị Amọrait na-achị mgbe o bi na Heshbọn. 11Ọ gụnyekwara Gilead, nʼoke ala ndị Geshua, na ndị Maaka, na ugwu Hemon niile, na Bashan niile, ruokwa Saleka. 12Ya bụ, obodo niile nke Ọg eze ndị Bashan na-achị, mgbe isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. (Ọ bụ eze ikpeazụ nʼagbụrụ ndị Refaim.) Mosis busoro Saịhọn na Ọg agha, tigbuo ha, napụkwa ha ala ha. 13Ma ndị Izrel achụpụghị ndị Geshua na ndị Maaka, ya mere, ha nọgidere na-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.