Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Joshua laghachiri azụ busoo Hazọ agha merie ya, were mma agha gbuo eze ya, nʼihi na Hazọ bụrịị isi obodo alaeze ahụ niile.

Joshua 11:10 in English

Joshua 11:10 · Berean Standard Bible

At that time Joshua turned back and captured Hazor and put its king to the sword, because Hazor was formerly the head of all these kingdoms.

Context

8Onyenwe anyị nyefere ndị agha ha nʼaka ndị Izrel, ndị lụgburu ha, chụọ ha ọsọ ruo nʼoke ala Saịdọn, ruokwa ebe a na-akpọ Mizrefot Maim, na ruo nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼime Ndagwurugwu Mizpa. Ya mere, o nweghị ọ bụladị otu onye iro a hapụrụ ndụ nʼagha ahụ. 9Joshua na ndị agha ya mere ha ihe Onyenwe anyị kwuru na a ga-eme ha. Ha gbupụrụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, surekwaa ụgbọ agha ha niile nʼọkụ. 10Mgbe ahụ, Joshua laghachiri azụ busoo Hazọ agha merie ya, were mma agha gbuo eze ya, nʼihi na Hazọ bụrịị isi obodo alaeze ahụ niile. 11Ha ji mma agha gbuo ndị niile bi nʼobodo ahụ, bibie ha kpamkpam, ọ dịghị onye a hapụrụ nke na-eku ume. O sukwara Hazọ ọkụ. 12Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile,* jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.