Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Jabin eze Hazọ nụrụ nke a, o ziri ozi zigara Jobab eze ndị Madọn, zigakwara ndị eze obodo Shịmrọn na Akshaf,

Joshua 11:1 in English

Joshua 11:1 · Berean Standard Bible

Now when Jabin king of Hazor heard about these things, he sent word to Jobab king of Madon; to the kings of Shimron and Achshaph;

Context

1Mgbe Jabin eze Hazọ nụrụ nke a, o ziri ozi zigara Jobab eze ndị Madọn, zigakwara ndị eze obodo Shịmrọn na Akshaf, 2na ndị eze bi nʼobodo ugwu ugwu, na ndị bi nʼime Araba, na ndịda Kineret, na ndagwurugwu ọdịda anyanwụ, na nʼime Nafọt Doa, nke dị nʼọdịda anyanwụ, 3zigakwara eze ndị Kenan ndị bi nʼọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, zigakwara eze ndị Amọrait, na eze ndị Het, na eze ndị Periz, na nke ndị Jebus nke dị nʼala ugwu. O zigakwara eze ndị Hiv ndị bi na ndịda Hemon, na mpaghara Mizpa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.