Joshua 10:25
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Joshua sịrị ha, “Unu atụla egwu, maọbụ daa mba. Dịnụ ike, nweekwanụ ume, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị ga-eme ndị iro unu niile bụ ndị na-ebuso unu agha.”
Joshua 10:25 in English
Joshua 10:25 · Berean Standard Bible
“Do not be afraid or discouraged,” Joshua said. “Be strong and courageous, for the LORD will do this to all the enemies you fight.”
Context
23Ya mere, ha kpọpụtara ndị eze ise ahụ site nʼọgba nkume ahụ, ha bụ eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish, na eze Eglọn. 24Mgbe a kpụtara ha nʼihu Joshua, ọ kpọrọ ndị ikom Izrel niile ka ha zụkọta, ọ gwara ndịisi agha bụ ndị so ya jee, “Bịanụ nso, zọkwasịnụ ụkwụ unu nʼolu eze ndị a.” Ya mere, ha bịara zọkwasị ụkwụ ha nʼolu ha. 25Joshua sịrị ha, “Unu atụla egwu, maọbụ daa mba. Dịnụ ike, nweekwanụ ume, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị ga-eme ndị iro unu niile bụ ndị na-ebuso unu agha.” 26Emesịa, Joshua ji mma agha ya gbuo eze ise ndị a. Ọ kwụbara ha nʼelu osisi ise, ebe ha nọ ruo nʼoge anyasị. 27Ma mgbe anwụ bidoro ịda, Joshua nyere iwu ka e site nʼosisi wedata ozu ndị eze ise ahụ, tụba ha nʼime ọgba nkume ahụ, ebe ha zoro onwe ha. Ha ji nkume dị ukwuu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Nkume ukwuu ahụ dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.