Joshua 1:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”
Joshua 1:9 in English
Joshua 1:9 · Berean Standard Bible
Have I not commanded you to be strong and courageous? Do not be afraid; do not be discouraged, for the LORD your God is with you wherever you go.”
Context
7“Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga. 8Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma. 9Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.” 10Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha, 11“Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.