Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị.* Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis.* Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.*

Joshua 1:5 in English

Joshua 1:5 · Berean Standard Bible

No one shall stand against you all the days of your life. As I was with Moses, so will I be with you; I will never leave you nor forsake you.*

Context

3Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu. 4Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ. 5Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị.* Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis.* Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.* 6Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie. 7“Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.