Jona 1:8
Jonah 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?”
Jonah 1:8 in English
Jonah 1:8 · Berean Standard Bible
“Tell us now,” they demanded, “who is to blame for this calamity that is upon us? What is your occupation, and where have you come from? What is your country, and who are your people?”
Context
6Onyeisi ụgbọ jekwuru Jona sị ya, “Gịnị ka ị nọ nʼebe a na-eme, ị na-arahụ ụra? Bilie, kpọkuo chi gị, ma eleghị anya o nwere ike ileta anyị anya, meere anyị ebere, zọpụta anyị.” 7Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ sịrịtara ibe ha, “Bịanụ ka anyị fee nza mata onye ihe ọjọọ dị otu a sị nʼaka ya bịakwasị anyị.” Ya mere, ha fere nza, nza ahụ a maa Jona. 8Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?” 9Ọ sịrị, “Abụ m onye Hibru, na onye na-akpọ isiala nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala akọrọ.” 10Egwu dị ukwuu tụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha sịrị ya, “Gịnị ka i mere?” Nʼihi na ha matara na o si nʼihu Onyenwe anyị na-agbapụ ọsọ, nʼihi na ọ gwala ha rịị na ọ bụ otu o si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.