Job 27:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha; ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.
Job 27:14 in English
Job 27:14 · Berean Standard Bible
Though his sons are many, they are destined for the sword; and his offspring will never have enough food.
Context
12Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,
gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi? 13“Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,
nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. 14Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;
ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha. 15Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;
ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha. 16Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,
ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.