Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụbọchị ọzọkwa, ụmụ Chineke bịakwara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị. Ekwensu sonyekwaara ha ọzọ bịakwa igosi onwe ya nʼihu ya.
Job 2:1 in English
Job 2:1 · Berean Standard Bible
On another day the sons of God came to present themselves before the LORD, and Satan * also came with them to present himself before Him.
Context
1Ụbọchị ọzọkwa, ụmụ Chineke bịakwara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị. Ekwensu sonyekwaara ha ọzọ bịakwa igosi onwe ya nʼihu ya. 2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?”
Ekwensu zara onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.” 3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.