Native Bible

John 8:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ.

John 8:39 in English

John 8:39 · Berean Standard Bible

“Abraham is our father,” they replied. “If you were children of Abraham,” said Jesus, “you would do the works of Abraham.

Context

37Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu. 38Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.” 39Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ. 40Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a. 41Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.” Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.