Native Bible

John 7:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”

John 7:34 in English

John 7:34 · Berean Standard Bible

You will look for Me, but you will not find Me; and where I am, you cannot come.”

Context

32Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya. 33Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m. 34Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.” 35Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe? 36Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.