Jọn 6:57
John 6:57 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m.
John 6:57 in English
John 6:57 · Berean Standard Bible
Just as the living Father sent Me and I live because of the Father, so also the one who feeds on Me will live because of Me.
Context
55Nʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ. 56Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya. 57Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m. 58Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” 59O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.