Native Bible

John 3:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E tinyebeghị Jọn nʼụlọ mkpọrọ mgbe ahụ.

John 3:24 in English

John 3:24 · Berean Standard Bible

(For John had not yet been thrown into prison.)

Context

22Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime obodo Judịa, ebe ọ nọtụrụ nwa oge, meekwa baptizim. 23Nʼotu aka ahụ, Jọn nọkwa nʼọnụ mmiri Enọn dị nso na Salim na-eme baptizim nʼihi na mmiri buru ibu nʼebe ahụ, ndị mmadụ gakwara nʼihu na-abịakwute ya, ọ na-emekwa ha baptizim. 24E tinyebeghị Jọn nʼụlọ mkpọrọ mgbe ahụ. 25Nʼoge a, ịrụrịta ụka malitere nʼetiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere mmemme ịdị ọcha. 26Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, onye ahụ ị gbara ama banyere ya nọ nʼofe Jọdan na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwukwara ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.