Native Bible

John 16:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼihi na m gwara unu ihe ndị a, obi unu ejupụtala na mwute.

John 16:6 in English

John 16:6 · Berean Standard Bible

Instead, your hearts are filled with sorrow because I have told you these things.

Context

4Ana m agwa unu ihe ndị a ka ọ ga-abụ na mgbe oge ga-eru, unu echeta na m gwara unu. Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ nʼihi na mụ na unu nọ mgbe ahụ. 5Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ma ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu jụrụ m, ‘Olee ebe ị na-aga?’ 6Ma nʼihi na m gwara unu ihe ndị a, obi unu ejupụtala na mwute. 7Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. 8Mgbe ọ bịara, ọ ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.