Native Bible

John 12:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs.

John 12:22 in English

John 12:22 · Berean Standard Bible

Philip relayed this appeal to Andrew, and both of them went and told Jesus.

Context

20Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ. 21Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.” 22Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs. 23Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto. 24Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.