Native Bible

John 1:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”

John 1:49 in English

John 1:49 · Berean Standard Bible

“Rabbi,” Nathanael answered, “You are the Son of God! You are the King of Israel!”

Context

47Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.” 48Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.” 49Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.” 50Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.” 51Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.” 1:14 Maọbụ, mmadụ 1:23 Aịz 40:3 1:34 Onye Chineke họọrọ. 1:38 Ụfọdụ na-akpọkwa mkpụrụ okwu a, Rabaị. 1:42 Sefas bụ asụsụ Hibru, ebe Pita bụ asụsụ Griik, ma ha abụọ pụtara otu ihe okwute.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.