Jọn 1:49
John 1:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”
John 1:49 in English
John 1:49 · Berean Standard Bible
“Rabbi,” Nathanael answered, “You are the Son of God! You are the King of Israel!”
Context
47Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.” 48Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?”
Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.” 49Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.” 50Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.” 51Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”
1:14 Maọbụ, mmadụ
1:23 Aịz 40:3
1:34 Onye Chineke họọrọ.
1:38 Ụfọdụ na-akpọkwa mkpụrụ okwu a, Rabaị.
1:42 Sefas bụ asụsụ Hibru, ebe Pita bụ asụsụ Griik, ma ha abụọ pụtara otu ihe okwute.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.