Jeremaya 52:16
Jeremiah 52:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Nebuzaradan, hapụrụ ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ,* ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.
Jeremiah 52:16 in English
Jeremiah 52:16 · Berean Standard Bible
But Nebuzaradan captain of the guard left behind some of the poorest of the land to tend the vineyards and fields.
Context
14Usuu ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze ahụ, kwaturu mgbidi ahụ niile gbara Jerusalem gburugburu. 15Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buru ụfọdụ nʼime ndị dakarịsịrị nʼogbenye na ndị fọdụrụ nʼime obodo ahụ, ha na ndị ǹka niile fọdụrụ, na ndị ahụ ji aka ha gbakwuru eze Babilọn, bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ. 16Ma Nebuzaradan, hapụrụ ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ,* ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile. 17Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na Oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ahụ niile bulaa Babilọn. 18Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji ukwu niile, na ihe bronz niile, bụ nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.