Jeremaya 44:7
Jeremiah 44:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma ugbu a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Nʼihi gịnị ka unu ji chọọ iji aka unu wetara onwe unu ihe ọjọọ ndị a? Lee ka unu si duru ndị ikom na ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile, na ụmụ a mụrụ ọhụrụ niile na-agbala nʼala Ijipt, si otu a mee ka, ọ bụladị, otu mkpụrụ mmadụ hapụ ịfọdụkwa nʼala Juda.
Jeremiah 44:7 in English
Jeremiah 44:7 · Berean Standard Bible
So now, this is what the LORD God of Hosts, the God of Israel, says: Why are you doing such great harm to yourselves by cutting off from Judah man and woman, child and infant, leaving yourselves without a remnant?
Context
5Ma ha egeghị ntị, ha atọkwaghị ntị ha nʼala. Ha esiteghị nʼihe ọjọọ ha na-eme chegharịa, maọbụ kwụsị ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ. 6Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m na iwe m, nke rere dịka ọkụ megide obodo niile nke Juda, na okporoụzọ nke Jerusalem. Ya mere, ha ghọrọ mkpọmkpọ ebe na ebe tọgbọrọ nʼefu taa. 7“Ma ugbu a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Nʼihi gịnị ka unu ji chọọ iji aka unu wetara onwe unu ihe ọjọọ ndị a? Lee ka unu si duru ndị ikom na ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile, na ụmụ a mụrụ ọhụrụ niile na-agbala nʼala Ijipt, si otu a mee ka, ọ bụladị, otu mkpụrụ mmadụ hapụ ịfọdụkwa nʼala Juda. 8Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa. 9Unu echefuola ihe ọjọọ nna unu ha mere na ihe ọjọọ niile ndị eze Juda na ndị eze nwanyị Juda mere na ihe ọjọọ niile nke unu onwe unu na ndị nwunye unu mekwara nʼala Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.