Jeremaya 44:29
Jeremiah 44:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Nke a ga-abụrụ unu ihe ama nke ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ nʼebe a,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ka unu si otu a mara na mba m na-aba na m ga-emesi unu ike aghaghị iguzosi ike.’
Jeremiah 44:29 in English
Jeremiah 44:29 · Berean Standard Bible
This will be a sign to you that I will punish you in this place, declares the LORD, so that you may know that My threats of harm against you will surely stand.
Context
27Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum. 28Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha. 29“ ‘Nke a ga-abụrụ unu ihe ama nke ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ nʼebe a,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ka unu si otu a mara na mba m na-aba na m ga-emesi unu ike aghaghị iguzosi ike.’ 30Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m arara Fero Hofra, eze Ijipt nyefee nʼaka ndị iro ya, bụ ndị na-achọ ndụ ya, dịka m si rara Zedekaya eze Juda, nyefee nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, bụ onye iro ahụ chọrọ ndụ ya.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.