Jeremaya 44:12
Jeremiah 44:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka ndị ahụ niile fọdụrụ nʼala Juda, bụ ndị ahụ kpebiri nʼobi ha ịga biri nʼala Ijipt ghara ịdịkwa. A ga-ala ha nʼiyi nʼala Ijipt; ha ga-ada site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ. Ndị niile dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha na ndị niile dịkarịsịrị nta ga-anwụ. Ha ga-aghọkwa ihe ịbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe ọmụma ikpe na ihe nkọcha.
Jeremiah 44:12 in English
Jeremiah 44:12 · Berean Standard Bible
And I will take away the remnant of Judah who have resolved to go to the land of Egypt to reside there; they will meet their end. They will all fall by the sword or be consumed by famine. From the least to the greatest, they will die by sword or famine; and they will become an object of cursing and horror, of vilification and reproach.
Context
10Ruo ụbọchị taa, o nwebeghị onye ọbụla nʼime ha wedarala onwe ya ala, maọbụ tụọ egwu m; ha adịghị ejegharị nʼiwu m, maọbụ jidesie ụkpụrụ ndị ahụ niile m debere nʼihu ha na nʼihu nna nna ha aka ike, ịgbaso ya. 11“Nʼihi ihe ndị a niile, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ekpebiela m ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu; ekpebiela m ibibi Juda. 12Aga m eme ka ndị ahụ niile fọdụrụ nʼala Juda, bụ ndị ahụ kpebiri nʼobi ha ịga biri nʼala Ijipt ghara ịdịkwa. A ga-ala ha nʼiyi nʼala Ijipt; ha ga-ada site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ. Ndị niile dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha na ndị niile dịkarịsịrị nta ga-anwụ. Ha ga-aghọkwa ihe ịbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe ọmụma ikpe na ihe nkọcha. 13Dịka m si taa Jerusalem ahụhụ, otu a ka m ga-esi jiri mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, taa ndị ahụ bi nʼIjipt ahụhụ. 14O nweghị onye ọbụla nʼime ndị Juda ahụ fọdụrụ, ndị gara biri nʼIjipt nke ga-agbanarị ọnwụ. Ọ bụ ezie na ọ na-agụsị ha agụụ ike ịlọghachi nʼala Juda, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-alọghachi, karịakwa mmadụ ole na ole ndị ga-agbapụ agbapụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.