Native Bible

Jeremiah 43:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,

Jeremiah 43:2 in English

Jeremiah 43:2 · Berean Standard Bible

Azariah son of Hoshaiah, Johanan son of Kareah, and all the arrogant men said to Jeremiah, “You are lying! The LORD our God has not sent you to say, ‘You must not go to Egypt to reside there.’

Context

1Mgbe Jeremaya gwasịrị ndị ahụ niile okwu ahụ Onyenwe anyị Chineke ha ziri ya ka o zie ha, 2Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt, 3Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.” 4Ya mere, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha ahụ niile, nakwa ndị mmadụ ahụ niile nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụụ ịnọgide nʼala Juda.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.