Jeremaya 41:15
Jeremiah 41:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Ishmel nwa Netanaya, na mmadụ asatọ nʼime ndị agha ya, gbapụrụ ọsọ gbanarị Johanan. Ha gbalagara nʼala ndị Amọn.
Jeremiah 41:15 in English
Jeremiah 41:15 · Berean Standard Bible
But Ishmael son of Nethaniah and eight of his men escaped from Johanan and went to the Ammonites.
Context
13Mgbe ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha hụrụ Johanan nwa Kariya na ndịisi agha so ya, ha ṅụrịrị ọṅụ. 14Ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha na Mizpa, chigharịrị gafee nʼebe Johanan nwa Kariya nọ. 15Ma Ishmel nwa Netanaya, na mmadụ asatọ nʼime ndị agha ya, gbapụrụ ọsọ gbanarị Johanan. Ha gbalagara nʼala ndị Amọn. 16Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka Ishmel pụọ, bụ ndị ahụ Ishmel nwa Netanaya dọtara nʼagha na Mizpa, mgbe o buuru ụzọ gbuo Gedaliya nwa Ahikam. Ndị ọzọ Johanan si na Gibiọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe. 17Ha duuru ha na-aga, ma kwụsị nʼobodo Gerut Kimham, nke dị nso na Betlehem, ebe ha bu nʼobi ịga Ijipt,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.