Native Bible

Jeremiah 40:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ,

Jeremiah 40:7 in English

Jeremiah 40:7 · Berean Standard Bible

When all the commanders and men of the armies in the field heard that the king of Babylon had appointed Gedaliah son of Ahikam over the land and that he had put him in charge of the men, women, and children who were the poorest of the land and had not been exiled to Babylon,

Context

5Ma tupu Jeremaya atụgharịa ịhapụ ya pụọ, Nebuzaradan gwakwara ya ọzọ sị, “Laghachikwuru Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ na-elekọta obodo Juda niile. Gaa soro ya biri nʼetiti ndị gị, maọbụ i nwere ike gaa ebe ọbụla ọzọ dị gị mma.” Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ nyere ya ihe oriri hiri nne. O nyekwara ya onyinye, hapụ ya ka ọ laa. 6Ya mere, Jeremaya jekwuuru Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa, soro ya na ndị fọdụrụ nʼala ahụ biri. 7Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ, 8ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha. 9Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn:* birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.