Jeremaya 40:11
Jeremiah 40:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile,
Jeremiah 40:11 in English
Jeremiah 40:11 · Berean Standard Bible
When all the Jews in Moab, Ammon, Edom, and all the other lands heard that the king of Babylon had left a remnant in Judah and had appointed Gedaliah son of Ahikam, the son of Shaphan, over them,
Context
9Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn:* birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma. 10Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.” 11Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile, 12ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ. 13Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.