Native Bible

Jeremiah 38:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.”

Jeremiah 38:9 in English

Jeremiah 38:9 · Berean Standard Bible

“My lord the king, these men have acted wickedly in all that they have done to Jeremiah the prophet. They have dropped him into the cistern, where he will starve to death, for there is no more bread in the city.”

Context

7Ma Ebed-Melek, onye Kush, otu nʼime ndịisi ozi nʼụlọeze nụrụ na etinyela Jeremaya nʼime olulu mmiri. Mgbe eze nọdụrụ nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, 8Ebed-Melek si nʼụlọeze pụọ jekwuuru ya nʼebe ahụ sị ya, 9“Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.” 10Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.” 11Ya mere, Ebed-Melek duuru ndị ahụ pụọ. O buru ụzọ jee nʼọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ nke ụlọeze. Nʼebe ahụ, ọ chịpụtara ụfọdụ nkịrịnka akwa, na ụfọdụ uwe kara nka. O kenyere ha nʼụdọ, wetuore ya Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.