Jeremaya 38:26
Jeremiah 38:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe ahụ ị ga-agwa ha, ‘Anọ m na-arịọ eze arịrịọ ka ọ hapụ izighachi m nʼụlọ Jonatan, ka m nwụọ nʼebe ahụ.’ ”
Jeremiah 38:26 in English
Jeremiah 38:26 · Berean Standard Bible
then tell them, ‘I was presenting to the king my petition that he not return me to the house of Jonathan to die there.’”
Context
24Mgbe ahụ, Zedekaya gwara Jeremaya, “Ekwela ka ntị ọzọ nụ ihe ndị a niile mụ na gị kwuru, ma ọ bụghị ya, ị ga-anwụ. 25Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị anụ na mụ na gị kparịtara ụka, ha bịakwute gị, sị gị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe eze gwara gị, ezola ihe ọbụla nʼebe anyị nọ, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’ 26mgbe ahụ ị ga-agwa ha, ‘Anọ m na-arịọ eze arịrịọ ka ọ hapụ izighachi m nʼụlọ Jonatan, ka m nwụọ nʼebe ahụ.’ ” 27Ndịisi ọchịchị ahụ niile bịakwutere Jeremaya jụọ ya ajụjụ. Ọ gwakwara ha ihe ahụ niile eze nyere ya nʼiwu. Ha hapụrụ ịjụ ya ihe ọzọ, nʼihi o nwekwaghị onye ọzọ nụrụ okwu niile ya na eze kwuru. 28Jeremaya nọgidekwara nʼogige ndị nche tutu ruo ụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.