Jeremaya 38:22
Jeremiah 38:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị, “ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị, mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri. Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị, ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’
Jeremiah 38:22 in English
Jeremiah 38:22 · Berean Standard Bible
All the women who remain in the palace of the king of Judah will be brought out to the officials of the king of Babylon, and those women will say: ‘They misled you and overcame you— those trusted friends of yours. Your feet sank into the mire, and they deserted you.’
Context
20“Ha agaghị enyefe gị nʼaka ha,” ka Jeremaya zara ya. “Rubere Onyenwe anyị isi, site nʼime ihe m gwara gị. Mgbe ahụ, ihe niile ga-agara gị nke ọma. A ga-echebekwa ndụ gị. 21Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nye, lee ihe Onyenwe anyị mere ka m hụ: 22A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị,
“ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị,
mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri.
Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị,
ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’ 23“A ga-akpụpụtara ndị Babilọn ndị nwunye gị niile na ụmụ gị niile. Gị onwe gị agaghị agbanarị ha, ma eze Babilọn ga-ejidekwa gị, a ga-esurekwa obodo a ọkụ.” 24Mgbe ahụ, Zedekaya gwara Jeremaya, “Ekwela ka ntị ọzọ nụ ihe ndị a niile mụ na gị kwuru, ma ọ bụghị ya, ị ga-anwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.