Jeremaya 37:7
Jeremiah 37:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel kwuru, Ihe ndị a ka ị ga-agwa eze Juda onye zitere ozi sị gị rịọọ m arịrịọ, ‘Ndị agha Fero ahụ si nʼIjipt pụta bịa inyere unu aka ga-emesịa laghachi nʼala ha bụ Ijipt.
Jeremiah 37:7 in English
Jeremiah 37:7 · Berean Standard Bible
“This is what the LORD, the God of Israel, says that you are to tell the king of Judah, who sent you to Me: Behold, Pharaoh’s army, which has marched out to help you, will go back to its own land of Egypt.
Context
5Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha. 6Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya onye amụma ntị sị ya, 7“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel kwuru, Ihe ndị a ka ị ga-agwa eze Juda onye zitere ozi sị gị rịọọ m arịrịọ, ‘Ndị agha Fero ahụ si nʼIjipt pụta bịa inyere unu aka ga-emesịa laghachi nʼala ha bụ Ijipt. 8Mgbe ahụ, ndị agha Babilọn ga-alọghachikwa ibuso obodo a agha. Ha ga-emeri ya, dọta ya nʼagha, kpọọkwa ya ọkụ.’ 9“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu arafula onwe unu site nʼiche echiche sị, ‘Ndị Babilọn agaghị abịakwa ibuso anyị agha.’ E, ha agaghị abịakwa ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.