Native Bible

Jeremiah 37:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.”

Jeremiah 37:20 in English

Jeremiah 37:20 · Berean Standard Bible

But now please listen, O my lord the king. May my petition come before you. Do not send me back to the house of Jonathan the scribe, or I will die there.”

Context

18Mgbe ahụ, Jeremaya gwara Zedekaya, bụ eze okwu ọzọ sị ya, “Ihe ọjọọ dị aṅaa ka m mere megide gị, maọbụ megide ndị ọrụ gị, maọbụ megide ndị a, unu ji tinye m nʼụlọ mkpọrọ? 19Ebee ka ndị amụma unu nọ, bụ ndị ahụ na-eburu unu amụma na-asị unu, ‘Eze Babilọn agaghị ebuso unu agha, ọ gaghị ebusokwa ala a agha?’ 20Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.” 21Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche. 37:1 Bụkwa Jehoiakin

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.