Native Bible

Jeremiah 36:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼọnwa itoolu nke afọ ise nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda, e doro oge dị iche nye maka ibu ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. E kwusara ibu ọnụ a nye ndị niile nọ na Jerusalem, na ndị si nʼobodo Juda niile bịa na Jerusalem.

Jeremiah 36:9 in English

Jeremiah 36:9 · Berean Standard Bible

Now in the ninth month of the fifth year of Jehoiakim son of Josiah king of Judah, a fast before the LORD was proclaimed to all the people of Jerusalem and all who had come there from the cities of Judah.

Context

7Ma eleghị anya, ha ga-arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Ma eleghị anya onye ọbụla nʼime ha ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa, ka iwe na ọnụma dị ukwuu nke Onyenwe anyị ga-ekpughe megide ndị a ghara ịbịakwasị ha.” 8Baruk nwa Neraya mere dịka Jeremaya onye amụma si gwa ya. Ọ gụpụtara okwu Onyenwe anyị, nke dị nʼakwụkwọ ahụ, nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 9Nʼọnwa itoolu nke afọ ise nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda, e doro oge dị iche nye maka ibu ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. E kwusara ibu ọnụ a nye ndị niile nọ na Jerusalem, na ndị si nʼobodo Juda niile bịa na Jerusalem. 10Baruk nọ nʼọnụụlọ Gemaraya nwa Shefan, bụ ode akwụkwọ, gụpụtara ndị niile nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu Jeremaya, nke dị nʼakwụkwọ a dị nsọ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke ụlọnsọ ahụ. 11Mgbe Mikaya nwa Gemaraya nwa Shefan nụrụ okwu Onyenwe anyị nke e si nʼakwụkwọ ahụ gụpụta,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.