Native Bible

Jeremiah 36:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼụbọchị ibu ọnụ, nọdụ nʼebe ahụ gụpụtara ndị mmadụ okwu Onyenwe anyị ndị a ị dere nʼakwụkwọ dịka m kpọpụtara ha. Gụpụtara ya ndị Juda si obodo niile bịa nʼụlọnsọ ahụ.

Jeremiah 36:6 in English

Jeremiah 36:6 · Berean Standard Bible

so you are to go to the house of the LORD on a day of fasting, and in the hearing of the people you are to read the words of the LORD from the scroll you have written at my dictation. Read them in the hearing of all the people of Judah who are coming from their cities.

Context

4Ya mere, Jeremaya kpọrọ Baruk nwa Neraya ka ọ bịakwute ya. Mgbe Jeremaya nọ na-akpọpụta okwu ahụ niile Onyenwe anyị gwara ya, Baruk nọkwa na-edepụta ha nʼakwụkwọ. 5Emesịa, Jeremaya gwara Baruk okwu sị ya, “Ọnọdụ nke m nọ nʼime ya ugbu a agaghị ekwe ka m site nʼebe a pụọ jeruo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 6Nʼihi ya, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼụbọchị ibu ọnụ, nọdụ nʼebe ahụ gụpụtara ndị mmadụ okwu Onyenwe anyị ndị a ị dere nʼakwụkwọ dịka m kpọpụtara ha. Gụpụtara ya ndị Juda si obodo niile bịa nʼụlọnsọ ahụ. 7Ma eleghị anya, ha ga-arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Ma eleghị anya onye ọbụla nʼime ha ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa, ka iwe na ọnụma dị ukwuu nke Onyenwe anyị ga-ekpughe megide ndị a ghara ịbịakwasị ha.” 8Baruk nwa Neraya mere dịka Jeremaya onye amụma si gwa ya. Ọ gụpụtara okwu Onyenwe anyị, nke dị nʼakwụkwọ ahụ, nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.