Native Bible

Jeremiah 36:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze na ndị so ya nọdụ nʼoge a na-agụpụta akwụkwọ a atụghị egwu ọbụla; ha adọwakwaghị uwe ha igosi obi ọjọọ.

Jeremiah 36:24 in English

Jeremiah 36:24 · Berean Standard Bible

Yet in hearing all these words, the king and his servants did not become frightened or tear their garments.

Context

22Nʼọnwa nke itoolu ahụ, mgbe eze nọ nʼụlọ oyi ya, ọkụ na-enwukwa nʼime ite ọkụ dị nʼihu ya. 23Mgbe ọbụla Jehudi gụsịrị ibe akwụkwọ atọ maọbụ anọ, eze na-anara ya akwụkwọ ndị ahụ were agụba ode akwụkwọ chakasịa ha, wụnye ha nʼọkụ. O megidere otu a tutu ruo mgbe ọ wụnyechara akwụkwọ ndị ahụ niile nʼọkụ. 24Eze na ndị so ya nọdụ nʼoge a na-agụpụta akwụkwọ a atụghị egwu ọbụla; ha adọwakwaghị uwe ha igosi obi ọjọọ. 25Ọ bụ ezie na Elnatan na Delaya na Gemaraya rịọrọ eze sị ya adọkasịla akwụkwọ ndị ahụ, ma o geghị ha ntị. 26Kama eze nyere Jerameel otu nʼime ụmụ eze, na Seraya nwa Azriel, na Shelemaya nwa Abdeel iwu ijide Baruk ode akwụkwọ, na Jeremaya onye amụma, ma Onyenwe anyị zoro ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.