Jeremaya 36:14
Jeremiah 36:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ndịisi ahụ niile zipụrụ Jehudi nwa Netanaya, nwa Shelemaya, nwa Kushi, ka o jekwuru Baruk sị ya “Were akwụkwọ ahụ ị si na ya gụpụtara ndị mmadụ ihe, bịa.” Ya mere, Baruk, nwa Neraya, ji akwụkwọ a nʼaka ya jekwuru ha.
Jeremiah 36:14 in English
Jeremiah 36:14 · Berean Standard Bible
Then all the officials sent word to Baruch through Jehudi son of Nethaniah, the son of Shelemiah, the son of Cushi, saying, “Bring the scroll that you read in the hearing of the people, and come here.” So Baruch son of Neriah took the scroll and went to them.
Context
12o si nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ ode akwụkwọ dị nʼụlọeze, ebe ndịisi niile zukọrọ. Ndị a bụ ndị zukọrọ nʼebe ahụ; Elishama, ode akwụkwọ, na Delaya nwa Shemaya, na Elnatan nwa Akboa, na Gemaraya nwa Shefan, na Zedekaya nwa Hananaya, na ndịisi ọchịchị ndị ọzọ. 13Mgbe Mikaya gwara ha ihe ọ nụrụ Baruk si nʼakwụkwọ ahụ gụpụtara ndị mmadụ, 14ndịisi ahụ niile zipụrụ Jehudi nwa Netanaya, nwa Shelemaya, nwa Kushi, ka o jekwuru Baruk sị ya “Were akwụkwọ ahụ ị si na ya gụpụtara ndị mmadụ ihe, bịa.” Ya mere, Baruk, nwa Neraya, ji akwụkwọ a nʼaka ya jekwuru ha. 15Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ha gwara ya sị ya, “Biko, nọdụ ala gụọra anyị ihe dị nʼakwụkwọ a.”
Ya mere, Baruk gụpụtara ha ihe dị nʼakwụkwọ ahụ. 16Mgbe ha nụchasịrị okwu dị nʼakwụkwọ ahụ, ha lerịtara onwe ha anya nʼegwu, gwa Baruk okwu sị ya, “Anyị aghaghị ime ka okwu ndị a ruo eze ntị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.