Jeremaya 35:6
Jeremiah 35:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ha zara sị, “Anyị adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab nyere anyị iwu sị anyị, ‘Unu aṅụkwala mmanya, unu na ụmụ ụmụ unu.
Jeremiah 35:6 in English
Jeremiah 35:6 · Berean Standard Bible
“We do not drink wine,” they replied, “for our forefather Jonadab * son of Rechab commanded us, ‘Neither you nor your descendants are ever to drink wine.
Context
4Akpọbatara m ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼime ọnụụlọ ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Chineke. Ọnụụlọ a dị nso nʼọnụụlọ ndịisi ụlọnsọ, nke dị nʼelu ọnụụlọ Maaseia nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ. 5Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.” 6Ma ha zara sị, “Anyị adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab nyere anyị iwu sị anyị, ‘Unu aṅụkwala mmanya, unu na ụmụ ụmụ unu. 7Ọzọkwa, unu ewurula onwe unu ụlọ, unu akụla mkpụrụ ubi, maọbụ kụọ ubi vaịnị. Unu adọtarala onwe unu ihe ndị a niile, kama na-ebinụ nʼụlọ ikwuu. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka unu ga-esi bie ogologo ndụ nʼala ahụ unu bụ ndị ọbịa nʼime ya.’ 8Anyị erubela isi nʼihe niile nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab gwara anyị. Anyị na ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom adịghị aṅụ mmanya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.