Jeremaya 34:22
Jeremiah 34:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m enye iwu, ka Onyenwe anyị kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo Juda niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”
Jeremiah 34:22 in English
Jeremiah 34:22 · Berean Standard Bible
Behold, I am going to give the command, declares the LORD, and I will bring them back to this city. They will fight against it, capture it, and burn it down. And I will make the cities of Judah a desolation, without inhabitant.”
Context
20ka m ga-enyefe nʼaka ndị iro ha ndị na-achọ iwepụ ndụ ha. Ozu ha ga-abụ ihe oriri nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa. 21“Aga m enyefe Zedekaya eze Juda na ndịisi ọchịchị ya nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọ ndụ ha. Aga m enyefe ha nʼaka ndị agha eze Babilọn, ndị siterela nʼibuso unu agha wezuga onwe ha. 22Aga m enye iwu, ka Onyenwe anyị kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo Juda niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.