Native Bible

Jeremiah 34:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka Onyenwe anyị kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa.

Jeremiah 34:17 in English

Jeremiah 34:17 · Berean Standard Bible

Therefore this is what the LORD says: You have not obeyed Me; you have not proclaimed freedom, each man for his brother and for his neighbor. So now I proclaim freedom for you, declares the LORD—freedom to fall by sword, by plague, and by famine! I will make you a horror to all the kingdoms of the earth.

Context

15Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. 16Ma ugbu a, unu echigharịala, merụọ aha m; onye ọbụla nʼime unu akpọghachikwala nye onwe ya ndị ohu ndị ikom na ndị inyom ahụ unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, gaa dịka o si masị mkpụrụobi ha. Unu akwagidekwala ha ka ha bụrụkwa ndị ohu unu ọzọ. 17“Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka Onyenwe anyị kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa. 18Ma ndị ikom ahụ niile merụrụ ọgbụgba ndụ m, ndị ahụ na-edebezughị ọgbụgba ndụ ha gbara nʼihu m, ka m ga-eme ka ha dịrị ka nwa ehi ọgbụgba ndụ ahụ ha kpọwara abụọ, nke ha si nʼetiti ọkara abụọ ya gafee, maka imesi ọgbụgba ndụ ha ike. 19Ndị ndu Juda na Jerusalem na ndị ozi eze na ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a ndị si nʼetiti ọkara nwa ehi ahụ gabiga

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.