Native Bible

Jeremiah 33:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla.

Jeremiah 33:6 in English

Jeremiah 33:6 · Berean Standard Bible

Nevertheless, I will bring to it health and healing, and I will heal its people and reveal to them the abundance of peace and truth.

Context

4Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, kwuru banyere ụlọ ndị ahụ niile dị nʼobodo, na ụlọeze niile nke ndị eze Juda, bụ nke akwadara maka iji megide nnọchibido niile na mma agha 5nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile. 6“ ‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla. 7Aga m emekwa ka ndị Izrel na ndị Juda a dọtara nʼagha lọta. Aga m ewugharịkwa ha dịka ụlọ, mee ka ha dịrị ka ha dị na mbụ. 8Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.