Native Bible

Jeremiah 33:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba.

Jeremiah 33:24 in English

Jeremiah 33:24 · Berean Standard Bible

“Have you not noticed what these people are saying: ‘The LORD has rejected the two families He had chosen’? So they despise My people and no longer regard them as a nation.

Context

22Aga m eme ka ụmụ ụmụ Devid ohu m, na ndị Livayị, bụ ndị na-eje ozi ha nʼihu m, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe; ha ga-adịkwa ukwuu dịka uzuzu dị nʼọnụ mmiri osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ” 23Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 24“Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba. 25Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na m emeghị ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti mụ na ehihie na abalị, meekwa ka iwu na-achị eluigwe na ụwa guzosie ike, 26mgbe ahụ, agaara m ajụ ụmụ ụmụ Jekọb, na ụmụ ụmụ Devid ohu m. Agaraghị m ahọpụta otu nʼime ụmụ ya ka ọ chịa ụmụ ụmụ Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ma aga m eme ka ndị ha a dọtara nʼagha lọta; aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ha.’ ” 33:16 Na-atụghị ụjọ ọbụla 33:16 Onyenwe anyị, bụ ezi omume anyị

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.